Ugbawka O Bu Gini? Poem by Chris Jibero

Ugbawka O Bu Gini?

Ugbawka, obodo Ndi Bekee huru wusa owa
Welie olu ha elu tie oke mkpu n’obi uto
Ugbawka, obodo Ndi Ngara-ngara huru gbajie ukwu ha
Ugbawka, ala miri dike dika oka akuru n’igbede
Ugbawka. aka zuru igwurube
Ugbawka, obodo ndi ukwu
Ugbawka, isi a huru kwaa okpu
Ugbawka, ola edo Nkanu
Cheghi, Ugbawka o bu gini?

Ugbawka o bu gini chiri ngwa mma gi?
Gini mere i ji ejezi ije ugbua dika nkonko nshiko?
I gaa ihu, i gaa azu dika Akpurukpu Inyi Amaechi Ede Oko
Gini mere onye hu ugbua isi ebuo ya
Ahu amakwa ya jijiji dika nwata huru agu n’ohia nku?
Gini mere i ji gbaa dimkpa dika agidigba Alakuku
Mujukwaa ulo dika nne odu
Ma togboro n’ala ukporo dika ngwuro?

Ugbawka, a mara m gi mgbe gboo
Dika anyanwu n’awara oha
A makwa m gi dika dike nke adighi agba izu n’azu
A makwara m gi dika odogwu ji nani obo aka ya abuo
Dogbuo oke odum
Ma ugbua i buzi nani onyinyo n’awaghari n’efu
Ndi agbata obi hu gi
Ha ehihie isi site na imere gi omiko

Ugbawka o bu gini kwadara gi n’ala
Dika udara dabara n’ikpo nsi n’ime ajo ohia?
Udo adikwaghi n’etiti umu gi
N’ihi na ha ewerela esemokwu kuo n’obi ha
Dika mkpuru agbara
Otogbo kwa n’iru ha dika nma agha iru abuo
Ihunanya ka ha tubara n’ime oke osimiri
Dika mpekere ihe ahaputara n’eze onye ubiam
Nkocha, ntamu na okwu ikpe
Ka umu gi ji tuo utu nmanya ahia
O bu kwa iwe obi ka ha ji mere ugbe nmanya
Ntaji anya na ekworo aboruwo uwe nwuda ha
Asiri na ikwa emu bu kachifo ha
Nsi na aja bu kwa ekele ututu ha
Nke n’ezute madu n’onu uzo ama

Ugbawka o bu gini mere i gwoghi umu gi ntamu
Mgbe i gworo ha ara okorobia?
Ugbawka o bu gini mere umu gi adighi amuta ihe oma
Ngwa ngwa site n’aka ndi n’aga n’iru n’uwa?
O bu gini mere otutu umu ji eyinye onwe ha ajo aworo
Dika ili ndi amuma?
O bu gini mere ha ji buru ekwe ekwe n’ekwe n’uta ekwere?
Ihe ogbara ohuu umu uwa ndi ozo ji acho ndu mma
N’emeziri anyi inyanga tolotolo
Dika nwagbogho oma huru efulefu
Bu so o ji anya eri
Ugbawka o bu gini ji umu gi ajo aka
Site n’igbata ha okpokoro anya ahu igwe?
Ha wulie elu taa maka obi uto
Echi isi aburu ha so aja aja
Ugbawka anya miri juru anya
N’ihi na umu gi emewala m obi
Ha adighi achu ihe n’achu ha
Ha ewerela ntu na unyi tezuo gi ahu dum dika uhie
Nyawa kwa gi okpokoro ejula n’olu dika okoloto ola edo
Ma were eriri n’akpughari gi n’ahia Otu Onicha
Dika ekperima ejidere n’ohi aturu

N’ezie, n’ezie, Ugbawka, i bughi Ede Anyi Ogbu
Nke i ji abu Agu Mba Agu
Kama, o bu kwanu onye ga azoputa gi?

(c) Chris Jibero. 2010.

COMMENTS OF THE POEM
READ THIS POEM IN OTHER LANGUAGES
Close
Error Success