Enyi m, ezigbo enyi m
I budi nwanne m ka I bu nwanna m
Enyi m onye kwo m n'azu ukwu m na-eru ala
Kee nke i meere m I no na-akoghari
Enyi m, ezigbo enyi m
Onye agbatobi m nke m ji eme onu
Ezigbo enyi m bu maramara n'ihu gwompiti n'azu
Onye n'eme ka o na enyere m aka mana so ochi k'ona
achi m
I ga aburu m ezigbo m ezigbo agbatobi m
Enyi m, ezigbo enyi m
Cheta kwa na mgbe ikuku fere ka otule okuko na ekpuhe
Ihe a na-eme na nzuzo ga emecha puta ihe
Were ire gi guo eze gi onu
Onweghi ihe m ga-agwa onye ji mma aga m n'azu
Ruo mgbe m choro isi m acho ma ahughi m ya
Enyi m, ezigbo enyi m
Buru kwa enyi m n'uto na uju ya.
Kee nke i meere; onye ji mma ? A very nice Ibo Poem. Thanks for sharing.
This poem has not been translated into any other language yet.
I would like to translate this poem
thank you sir Edward