Agụụ (Hunger) Poem by Izunna Okafor

Agụụ (Hunger)



AGụụ (Hunger)



Izunna Okafor dere abụ a



Chịịị chịịị ka ọ na-atà n'afọ
Nwịị nwịị ka ọ na-amị n'ọkpụkpụ
Agụụ bụ aha ya
Ị kpọọ ụganị ọ za gị

Agụụ bụ echete ebeme
O nweghị nne, nke o ji enwe nna
O nweghịkwa ikwu na ibe
Agụụ bụ aha ya

Agụụ amaghị nwoke na nwaanyị
Ọ haghịkwà ụmụntakịrị aka
Mere e ji akpọ ya otii nwata n'ihu nne ya
Agụụ bụ aha ya

Agụụ anaghị asọ anya
Agụụ naghị eme ihere
Agụụ anaghị asị ndo
Agụụ bụ aha ya

Ọrọbọ na-atụ ya égwù
Atịngà na-agbara ya ọsọ
Dike akpụ obi na-asọkwa ya asọ
Agụụ bụ aha ya

Agụụ enweghị ényì
Agụụ enweghị onye iro
Mana ebe ọbụla ọ bàtàrà
a chọọrọ ya ihe ọ na-eri
Agụụ bụ aha ya

I mete ya enyi, ọ ka njọ
Ị tụ ya iro, ọ nyụọ gị anya
Ọ bụ orufọrọ be onye
Agụụ bụ aha ya

Agụụ na-amịkpọ mmadụ
Na-eme nwata okenye n'akaghị aka
Ma ya onwe ya adịghị aka nka
Agụụ bụ aha ya

Agụụ bụ ọnwụnwà
Agụụ na-ete mmadụ ure n'ọha
Agụụ bụkwa ọranyere nwata anya n'ogwu
Agụụ bụ aha ya.

Ọ na-adị ka ọnwụ na-egbu ọhà
Mana ọnwụ ekweghị ewere ya
Kemgbe okike ụwa ka o siri kpaba ike
Agụụ bụ aha ya

Kwashiọkọ bụ afọ ime ya
Ọnya afọ bụ òghùghù ọmụmụ nwa
N'ala ili ka ọ na-akpdobe ike
Agụụ bụ aha ya

Agụụ eriela ọtụtụ isi
Mana afọ ekweghị eju ya
Ọ bụ nke e mere jụọ oyi
Agụụ bụ aha ya

Agụụ dị njọ
Agụụ dị n'ala anyị
Agụụ ahịala ụmụ mmadụ ọnụ
Agụụ egbuo ndị a
Agụụ...

© Izunna Okafor,2019.

Agụụ (Hunger)
Friday, April 24, 2020
Topic(s) of this poem: hunger
COMMENTS OF THE POEM
READ THIS POEM IN OTHER LANGUAGES
Close
Error Success