Mma (Beauty) Poem by Izunna Okafor

Mma (Beauty)

Rating: 5.0

Izunna Okafor



Kere kere ka ọ na-egbu
Ọbụnadị n'anya onye ìsì
Onye chi ya gọzìrì
O were nke ya, mebe ngàlá

Mma adịghị n'ótú Ọnịtsha
Maka na ihe dị ụtọ bu ihe dị ụkọ
Ọ bụ ezie na e nwere adịgbòlója
Mana ihe a gba n'aka
E jighi ènyò ele ya

Mma so n'ihe nwaanyị jiri ka ibe ya
Ọ bụghị naanị mma ihu
Ma ọ bụ ọcha ihu fanta ọkpọ kooku
Kama, ezi agwa bụ mma nwaanyị

Ụmụ nwoke nwere nke ha
Ọ bụghị naanị mma afọ ọnụ
Kama site na mpempe akwụkwọ na-esi ajọ isi
Maka na ego bụ mma nwoke
Onye nwekarịa, ọ makarịa
N'anya ụmụ nwaanyị
Na-agbanyeghị ole afọ ọnụ ya ha

Mma bụ ego
Mma bụ agwa
E nwerekwara mma ihu
Mma bụkwazị ihe ónwúnwé

Mma niile a dị mma
Mana ihe kacha mkpà bụ
Gịnị ka onye nwe ya jiri ya mepute
Tupu à tụnye ihe niile ahụ n'igbé
Maka na agbọghọ na-esu ùdù
Oge ya ana-aga

Mma nịịle nwere ebumnobi
Mma abụghịkwa ihe ngàlá
Mma abụghịkwa maka ịpịa ọkụ
Maka na otu ụbọchị
Ihe niile ahụ ga-aba n'ajọ ọcha

Lezie anya ma hazie mma nke gị
Ka i wee sòró àbàlà mụrịa amụ
Maka na mma na-agafe agafe
Abụkwa orechaara buusu goro nkịta



Maka Onye Dere Abụ A:

Izunna Okafor bụ nwaafọ Ebenatọr dị n'okpuru ọchịchị Nnewi Sawụtụ nke steeti Anambra. Ọ bụ onye edemede iduazị na abụ, onye nta akụkọ na onye nkwàlite asụsụ Igbo. Ọ gụrụ na mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka, bụ ebe o mere maka ihe ọmụmụ nhazi ọhanaeze bụ 'Public Administration' n'olu bekee.

Dịka onye edemede, o nwetala ntúrú ùgò na nkwanye ùgwù karịrị iri abụọ na ise n'ihe gbasaara edemede, site n'ala anyị na n'ogoogo mba òfèsi. Nturu ùgò na nkwanye ùgwù ndị ahụ gụnyere: Nigerian Writers Award/Indigenous Writer of The Year 2015/2016; Pita Nwanna Award for Igbo Literature 2015; Nigerian Heritage Icon Award/Young Writer of the Year Federal Republic of Nigeria 2016; Anambra Exclusive Youth Choice Award/Youth Writer of The Year 2016; Future Award Africa 2016/African Prize For Education; SLAM Hero Youth International Award/Innovative Youth of the Year 2016;Inspire Award/Outstanding Youth in Academics 2017; Ezenwa Ohaeto Prize for Young Nigerian Novelists 2015; Campus Best Writer/Journalist of The Year 2018, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Dịka onye nta akụkọ, ọ na-arụ n'ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra, ma na-arụkwa n'ụlọ ọrụ Igbo Radio, bụ ụlọ ọrụ dị n'ikùkù ma nwee isi ngàlàbà ya na mba Canada.

Izunna na-ede akwụkwọ n'asụsụ Igbo na n'asụsụ bekee, ma bụrụkwa onye e jìrì ịkwàlìtè asụsụ na omenala Igbo wee mara.
O deela akwụkwọ asatọ, ma nwekwa edemede karịrị narị asatọ n'ọnụ ọgụgụ o bipùtagòrò n'ìkùkù. Ọ bụ onye isi òtù jikọtara ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ n'ala Nigeria, ngalaba steeti Anambra.

Mma (Beauty)
Wednesday, February 12, 2020
Topic(s) of this poem: beauty
COMMENTS OF THE POEM
Kingsley Egbukole 14 February 2020

An interesting poem written in Igbo language. Beautiful

0 0 Reply
READ THIS POEM IN OTHER LANGUAGES
Close
Error Success