Ndi Ọcha Na-Eme Ya Poem by Emmanuel Aneto

Ndi Ọcha Na-Eme Ya

1.i na-ekwukarị ihe a
ejidela m gị imirikiti ugboro
ọ dị m k´ichefuola
chaii! Ama m n`ịmaghị mgbe i ji ekwu ya
ewoo! ọ dị m ka ọ baala gị n´ọbara
і na-ekwukarị "ndi ọcha na-eme ya" "ndị ọcha na-eme ya"

2. I mee nkeọma ị si na ndị ọcha na-eme ya
I mee nke ọjọ і tie na ndị ọcha na-eme ya
I gbaa bọọlụ ọfụma ị sị na ị gbara ya ka esi agba n`Iropu
I gba egwu ọfụma I si na ndi ọcha na-emekwa otu ahụ
I gụọ egwu ọfụma ị si na olu gị atọka ka nke ndị ọcha

3. Aga m akọdị ole hara ole
Umuada Igbo na-efezi n´elu n´elu
Anya Ikwiikwii, ihu anyara pọtọpọtọ na Ntutu ndi ọcha ka ha jizi achọ mma
Umuokorobia anaghị achọtanwuzi nwaada ha ga-alu
Umuokorobia na-agbazi mbọ ka ha nwee akpụ isii n`afọ, nke a na-akpọ 6 packs

4. Eziokwu na Ikpemkwụmọtọ abụrụla Ngweahia a na-ere penipeni
Ndị Okenye anyị na-atazi mkpụrụ osisi a sị ha atala, ARụ!
Ugwu na Nsọpụrụ ndi Okenye abụrụla ihe mere n`oge mgbeochie
Ụmụaka amazighi onye ha ga-eso
Oke n´ụlọ, Ngwere n´ọhia
Ew! Arịrị egbuo m! , Arịrị egbuonu mo! Obi agbawaalanu m o!

5.Ewoo! Kedụ onye kụrụ gị ọtụmọkpọ a
Nne, I jizikwa anya gi eme ihe a, nwoke m, uche gi ọ dịzịkwa ya
I mee elumee ala I sị na ndi ọcha na-eme ya
I fọọ Onugbu ọfuma I sị na-ifọrọ ya ka ndi ọcha
I rọọ nrọ mara mma i sị na ọ dika nrọ obodo oyibo, nrọ ndi ọcha
Aha gi bụ Ezinne, I sịi kpọwa gi zinizini, Chinaza bụzi zanizani
Osinachi bụzi SINACH
Aha gi bụ eze I sị kpowa gi Kingo

6. Nwa gi na-asuzi oyibo ka onye Amerịka, Igbo ya bụzi ATAKATAELOO
I sụọ okpo-okpo Oyibo, etuo gi ONYEMAAKWỤKWỌ PROF! !
I sụọ Igbo a si na i bụ ITIBỌRḹBỌ, old skul, igbotic
Gee ntị, ma ị sụrụ German, English, ma ọ bụ Igbo, ha niile bụcha Asụsụ
Onye sụrụ bekee ọfụma akaghị onye sụrụ Igbo ọfụma mara Akwụkwọ
Ndi Igbo nọ na Obodo niile na-asụ asụsụ ndị ọcha dị ichiche
Onye ọcha kwuo otumkpụrụ okwu Igbo, anyị amalie elu, kụọ aka, tie Chinekeee!

7. ị hụ foto nwoke onyeọcha I kpọọ ya Jesu, kpọọ isiala mee N`AHA NNA…
Mana I hụ foto Nwoke Onyeoji etinyere mpi na ọdụdụ, o bụrụ gị Ekwensu
I fufee aka n`isi tie "Holy Ghooooost Fire! "
I makwa na Jesu bu "OZURUMBAONU"?
Foto ndi mmụọọma niile nọcha n`eluigwe bụcha ụmụaka ndị ọcha
Ka nke a dịwakene!

8. ị gbaa Nkwụ n'ụlọ, I gbaa Akwụkwọ n`ụka
Nwanyi ga-eyiriri akwa ocha n´Agbamaakwụkwọ, ndi ọcha na-eme ya
Nwoke ga-akporịrị Kotu n´Agbamaakwụkwọ, ndi ọcha na-eme ya
Nwa gị ga-azarịrị aha ndị ọcha n´mmirichukwu, ndị ọcha na-emekwa ya

9. Daddy na Mummy, ka ụmụ gi na-akpọzi gị
Chai! Papa na Mama dizi `Igbotic´
ụmụ gi na-eri Indomie n`ụtụtụ, Spaghetti n`ehihie, Maccaroni n`Abalị
Ekwentị na Kọmputa ka ha jizi mere ụmụnne
Akụkọ Ifo na Gwamgwamgwam alaala
Chai! Ewu ataa m Igu n´isi
Ew! Arịrị egbuo m o! , arịrị egbuonụ m oo! !

10. Igbo ndị ọma, Kedụnụ ebe mmiri siri banyenụ Opi Ugbogoro?
Kedụ ka anyi ga-esi kwọrọ Nwanyi Ukwu wara?
Umu Igbo! Anyi nọzịkwa mmadụ mmadụ na-esizi mmụọ mmụọ
Omenaala anyi na-alazinụ n´oku n´oku
Njirimara anyi na-etipiazi n´ike n´ike

11. Igbo ndi oma, ka anyi mụrụnụ anya dịka Agbịsi
Oke anaghi eri ihe onye mu anya
onye ụlọ ya na-agba oku anaghị achu Oke
Anyị agaghi ahapu Njirmara na Omennala anyi kpamkpam chowa nke ndi ocha
Onyenankeya, Nkemdirim, Ahamefula abụghi Aha ọjọọ
Ufọ ji fọ, ụfọ ala afọ
ọgwụla ka ọ ha m n´ọnụ
Ndeewonụ

Monday, December 10, 2018
Topic(s) of this poem: elegy
COMMENTS OF THE POEM
READ THIS POEM IN OTHER LANGUAGES
Close
Error Success