Nkita Nyara Akpa Poem by Chukwuebuka Adebayo

Nkita Nyara Akpa

Nkita nyara akpa,
Nshi agwunu n'ohia,
Mgbe ochichiri dara n'ala,
Odachi ewere aka ike na-achi.
Ndi ojoo na-ezo n'ajo omume
O bu onye makwanu Anya ha?
Ndi oji aka igwè achi.


Aru ha na-kpawa di egwu
Ha-achosi ike iji bibie ihe digo mma
Ha na kpaghasi ogba aghara.
Ndi aka di ocha na-ata ahuhu
Alili ka umuaka na-ebe n'akwa
Maka ndi obi-nkoropu, ha-enweghi omiko—
Olisa nke igwe, o Kwa gi ka m na-kpoku.



Nyenu anyi aka anyi bilie, megide oké osimiri,
Nyen'anyi Ike iji tijie agbu ochichi aka-ike
Iji kwuzi ochichi obi ojoo.
Nyen'anyi ukwu ibanye na njem gaa n'ìhè
Ka anyi Wepu ike mmegbu ha
Gosi uwa omiko na ihunaya
K'Anyi ebili udo, di ka nduru n'ebi.

COMMENTS OF THE POEM
READ THIS POEM IN OTHER LANGUAGES
Close
Error Success