Ifeoma Di Niro Poem by John Chizoba Vincent

Ifeoma Di Niro

Onye ebezina na uju na oga adinma
Onye echezina maka na echi nabia
di ime oweghi onye ma ihe oga amu
obu nwoke ma nwa nwayi oma
Jiri ndidi sowe uwa na oga adinma
Efi na eweghi odudu obu chi ya na
Achuro ya ijiji na ahu ya oge nile.


Onye ejila ugobe nke ndu ya na aka ya
Make uwa bu nke na akpa onye ya yo ba chukwu
Maka na emesia na oga adinma kpebere obasi
Mezie onwe gi emezi maka echi na abia abia,
Ifeoma di niro onye elela anya na azu.


Le ka umununu si agba egwu na elugwe
Le ka ndi ekwe na akopu onu ha nile
Lekwa ka elugwe na eluwa si buru enyi ugbua
Okuko na Efi na Mbe na akparita uka na udo
Maka na ifeoma ka ha nile nacho na uwa.


Ebezina na chukwu no nso
Ficha anya gi na ifeoma na abia
Ifeoma di niro, nke di iro ka nma
Ogazi amaka ejiri ya ago mmuo
Oweghi ihe na adigidi na eluwa
Mezie owegi emezi na oga adinma.

Thursday, May 19, 2016
Topic(s) of this poem: africa
COMMENTS OF THE POEM
READ THIS POEM IN OTHER LANGUAGES
Close
Error Success