Ọlaedo m,
Ma n'anwụ, ma n'ozizo, ma ọbụ n'ụgụrụ nke ụwa,
Otuọbụla o siri dị,
Olaedo m, i bụ obi aṅụrị m
Otu naanị nke m nwere
My golden jewel, no matter the life's weather condition,
You're my joy
My one and only
Ọlaedo m,
Ekpere m bu n'obi
Ọchị di m n'ihu, na ekele di m n'ọnụ
I biara mgbe m ji chọọ gi karịa uruniile dị n'ụwa
I biara ọfụma
Keekwanụ ka m ga esi gosi gi ka aṅụrị m ha
My golden jewel,
The prayer in my heart
The smile on my face and the praises on my lips
You came when I needed you more than I needed every other benefit of life
You came well,
How can I display to you the amount of my gladness
Ọlaedo m,
Ka m bụrụ otu nwoke mmeri a meriri obi gi
Nke duuru gi ebe nsọ nke agbamakwụkwọ
Nke gakwa aga ebe gi nke bụ ebe karichara nsọ
Ebe anyị abụọ ga emepụta ndi Chineke sịrị anyị gaa mepụta
Mkpụrụ ihụnanya anyị
Ọlaedo m, mgbe i kpọrọ di gi, ure gi, oku
K'ọbụrụ m pụtara bia za gi
My golden jewel
Let me be the winner who won your heart
And match you to the altar
Let me be the one to enter into your holiest of holies
Where together we shall produce the creator's heritages
The seeds of our love
My golden jewel, when you call on your husband and pride
Let me be the one that answers
Ọlaedo m
Kedụ ebe i chọrọ ụgbọ akụnụba duru gi
Kwe ka m bụrụ ọnyịnya gị
Iheọbụla bụ arọ ndụ gị
Otuọbụla i chọrọ ịmetụ ụwa a
Kwe ka m bụrụ kpakpandụ na-ezi gi ụzọ
Ka m bụrụ ngalaba i nwere ike ịdabere
Ọbụladi mgbe o ji dị ka ike ekweghi gi
Otu i nwere ike bụrụkwa nye m
Tinyekwa na anyị ga-abụrụkwa ezigbo enyi onwe anyị
Ga-anọnyere ibe ya n'oge niile
My golden jewel,
Where would you want the ship of wealth to lead you
Let me be your captain
Whatever is your life's dream
However you want to influence this world
Let me be the star that leads the way
Let me be the pillar you can lean on
Even when you may be getting weak
As you will be to me too
And we will be each other's friend
That will be there for us at all times
Ọlaedo m
Ọ bụzi sọ gị dị m n'obi n'oge niile
Ihunaanya m nwere n'ebe i nọ
Kariri ihe ọgụaja ga agụtali
I bụrụla m ezi udo nke chi nyere m
Ọ di m obi nma
My golden jewel
You occupy my heart at all times
The love I have for you is immeasurable
(more than the sand counter can count)
You have become to me a perfect peace given to me by God
It gladdens my heart
This poem has not been translated into any other language yet.
I would like to translate this poem