Leenu m
Leenu ka m nọ na-agba mgbaghari
A na m achọ onye ọ ga adị mkpa ka osi gbaa m gharị
Onye ga-akpọdu m obodo oyibo
Obodo ebe ihunaanya m nọ
Ebe akwụkwọ na ọrụ bekee duuru ya gawa
Mee ya ya-echefuo na anyi kwesiri nkwadobe ngbamakwụkwụ di na nwunye anyi
Tupu ya ejewe njem a
Ụto obi m, Ị hapụrụ m
Ị hapụrụ m mee tiravụlụ
Ị jewazie njem obodo oyibo
Ugbua mụna onye ga-ebi?
Onye ka mụna ya ga-anọ?
Ụto obi m, chai!
Onye ka ịsị m lụwazienu
Ihe ndì m na-echete banyere gi anaghi ekwe m hụ ụzọ
Ha na-agba m anya mmiri
Egwuregwu ọnwa ndị ahụ mụ na gi na-egwukarị
Ọchị ndị anyị chịrị,
Onye na-achọ ibe ya, na oorooro ndị anyị gbara
Ụda olu gi mgbe ndị ahụ Ị bụụrụ m abụ ụto
Chai, ezigbo Ọlaedo m,
Ony ka Ị chọrọ ka ọ bia hichaa m anya mmiri a
Site tupu Ị pụọ njem obodo oyibo ruo ugbua,
Obi m ahụbeghi onye dị ka gị
Udi mmadụ gị adịghị udi abụọ
Kpakpandụ di ka gi
Udu mmiri ọma dị na etiti ala ọkpọ
Nwaanyi e ji e je mba
Nne gi na nna gi zụrụ gi ọfụma
Ị wụ nwaanyị dị oke ọnụ
Anụ kpọrọ nkụ n'eju ọnụ
O nwere ọmalicha ọzọ m ga-asi n'oyiri gị?
Udi nwaanyi na-enye nwoke obi ume-iru-ala
Ya mere, udi gi bụ udi na ụwa a ma ụwa n'abia abia
Ị ga-abụrụ m onye masiri obi m
Biko ezigbo Ọlaedo m, nwaada ọma m,
Ahapụla m
Anọkwa m na-achọ onye ga-akpọta m obodo oyibo
Ka m nọgodi na-elegide gi anya
Ka Ị hapụ ihapụ m ebea
Chọrọ onye ọcha lawa
Biko esokwala onye ọcha ala
Chetekwa na Igbo wụ ndụ
Ị wụnụ nwaafọ, nwaada Igbo
Ka anyị jidesie onwe anyị aka
Ma-onweghi maka ihe ọzọ
K'ọbụrụ maka ihunaanya dị n'etiti mụ na gị
Ka anyi mụta ụmụ ahụ ha ga-acha mụrụ mụrụ di ka mmanụ a kwọrọ aka sụọ
Biko Chidi Okolo m
Ya bụrụ ụgbọ elu n'efere n'onwe ya
Zitere m ka m chọrọ gị bia
Ka obi ruo m ala
Ka ite ihunaanya anyị
Na atọ ka mmanụ anụ dika o si dị na mbụ
Ahụrụ m gị n'anya, ihunaanya m
This poem has not been translated into any other language yet.
I would like to translate this poem