Uche Bụ Akpa Poem by *Tony_Cemalukwuoo* Egbuonu

Uche Bụ Akpa

Rating: 5.0

Uche bụ akpa.
Okwelu kwelu ekwe
Ofu ọnụ madu
Bụkwa ọnụ mmụọ

Mmụọ?
Ekwensu so kwa
Eeemechaa odazie
Ekwensu ribe arịrị

Odufuo ụmụ Chukwu
Ọ bee ṅnaa eee eee
Okwu ịtọ dịka chacha
Ezokwanuya ezo?

Ụmụ agụ ga abụriri agu
Ụmụ Ojoto, Ojoto
Ụmụ Chukwu abụzi gịnị?
Chukwu?

Ebe Ojoto bụ ofu
Gịnwa nwa Chukwu
Munwa, nwa Chukwu
Nwa pụta, nwa puta
Umụ Chukwu eju

Isii mụ si gịnị,
Ka isii mụ juaa onye?
Juzie ase, ma jukwuo ha
Ndị kwelu ma ndi riri arịrị
Maka okwu dịka chacha

POET'S NOTES ABOUT THE POEM
Freedom of free will from a crisscrossed reflection on thrio thriller books - I Believe, Sorrows of Satan and Three Magic Words.
COMMENTS OF THE POEM
READ THIS POEM IN OTHER LANGUAGES
Close
Error Success