Oké Osimiri Dị Jụụ Na-Ehi Ụra Poem by Tony-Cemaluk Egbuonu

Oké Osimiri Dị Jụụ Na-Ehi Ụra

Rating: 5.0

Ụnyahụ ka m nwụrụ
Ee, obu mgbe m na-agafe oke osimiri
Ị hụrụ anyanwụ m dara ada
Dị ka ngba ama eriri ukpoo azu na-emikpu

Echi ma ọ bụ echi echi
A ga-eli m ná ndụ naanị m
Na-ese n'elu dị ka ihe dakpulu mmiri
Maka ịgbachi nkịtị gị

Kwaa ákwá n'ihi na mmiri riri m n'ime omimi gị
Dị ka a ga-asị na onye ahu banyere
Ka etinyere ya n'ili n'enweghị ụgwọ
N'ili di mmiri mmiri
Nke oké osimiri gbaa nkịtị na-ehi ụra

Ekwela ka gị kpuo ìsì
N'ihu ndi aghugho Pirates
Na-eru uju ruo mgbe ị ga-eteta n'ụtụtụ
Ebe m ga-ahapụ ebe nke gi a
Di mmiri mmiri ma dikwa ndu

Na-eto eto ma na-enwu ọhụrụ ọhụrụ
N'ime mkpọmkpọ ebe a
Na-emerụghị ahụ ma ọ bu ree ọkụ
Emelitere m ọhụrụ ka nwa nwoke bilitere
Ekpuchiri ya na ngbuke ìhè dị ka ọnwa
Ma ọ bụ ìhè anyanwụ na-awa ọhụrụ

This is a translation of the poem Sleeping Silent Sea by Tony-Cemaluk Egbuonu
Sunday, October 8, 2023
COMMENTS OF THE POEM
Close
Error Success