Guzosie Ike Poem by Chris Jibero

Guzosie Ike

O bu onye ka uwa huru
Mechie onu ya n'ehi miri
Dika ulo ajadu
O bu onye ka uwa huru hapu
O bu onye ka uwa huru
Hapu itughari ya dika ugbo epepe
Ebiri miri n'atughari
O ghara ya gaa elu
O ghara ya gaa ala
Acho onye o ga elo
Dika utara ya na ofe onugbu
Nke akworo aka sie nke oma
So ezi ada gaa ikele okpara nna ya

Ekwela ka uwa rie gi dika miri ide
N'achi oku wara wara
Ekwela ka umu madu were gi hichaa ike nsi
Dika akwukwo anochatara n'ozara
Ekwekwala ka umu uwa mee gi ka
I buru oche onye okpu isi

Guzosie ike n'onodu gi
Dika ugwu Udi
Ekwela ka madu ibe gi tupu gi
Dika igwu bi n'isi onye isi ya
N'akwo murumuru dika ike adaka
N'ihi na uwa adighi onye o bu nke ya
Anyi nile biara abia
Burukwa ndi nlekota uwa
Onye nwe uwa gara njem
Ma echefukwala na onye gara njem
Ga alota bia lee otu ulo ya di.

(c) Chris Jibero.

COMMENTS OF THE POEM
READ THIS POEM IN OTHER LANGUAGES
Close
Error Success