Udo Di Na Mba Poem by Michael Eziudo

Udo Di Na Mba

Kedu ebe o gbabara?
Kedu ebe anyi nokwanu na acho ya?
O di anya? Ka ono nso?
Leenu gburugburu gi, lee n'elu lee n'ala
Welie ute elu, buligodi ite ahu elu
Udo anyi na-acho obu nke a di na mba?

Nwoke e bulie mma
Nwanyi achiri oso
Umuaka ana enyoba anya n'echi
Anya mmiri ana awu bara bara bara
Kedu otu echi anyi ga-adi?
Ana eji ogu achota udo?

Nwanne n'egbu nwanne
Nke ojii na achu nke ocha
Ndi okpoisiala na ndi onyenwe ha nwuru n'obe
Uzun ogbunigwe na uda mgbo egbe
Obara abughizi ihe nso
Ana eji agha akpata udo?
Ana eji esemokwu eri ji di oku

Anyi na acho udo mana udo di ebe a di anya
Udo di na mba
Mba nke na adighi n'obodo anyi
Mba nke na adighi na ezi n'ulo a
Mba nke na adighi n'ime obi onye

Ikpolata udo ulo abughi ihe amara-amaghi
Nwanyi onye choro ka o ga emepe anya luru
Ma dika umunwanyi, ma ejimaghi ya
O wooro gi onye akwuna, churu okoro puo ama
K'anyi mara amara mee ya
K'anyi kpolata udo a di na mba ulo

O bu okwu diiri mu na gi

Tuesday, March 21, 2017
Topic(s) of this poem: peace
POET'S NOTES ABOUT THE POEM
Igbo
COMMENTS OF THE POEM

Otu a ka odi. Odogwu jisi ike Udo ahu di na mba ga-alatariri ulo

0 0 Reply
READ THIS POEM IN OTHER LANGUAGES
Michael Eziudo

Michael Eziudo

Benin City, Nigeria
Close
Error Success