Ọkụkọ Amaghị Òké Àlà Poem by Ifeanyi John Nwokeabia

Ọkụkọ Amaghị Òké Àlà

Ala niile gbara ụwa gburugburu bu ótu
Ikwu amaghị, ibe ya ezi ya bu ije ụwa
Onweghi onye ma ebe nwanne ya si eku ume
Mmiri n' ezoro ọgaranya n' ezoro ogbenye.

Ọkụkọ bịa ebe ọ maghị ala, o were ótu ụkwụ kwụrụ
Mànà ọ gbazua ányá ya okirikiri, o fepu gbagharia
Ọ bụrụzia akụ enweghị ilo dịrị ndị agbataobi ya
Ọguta ya ebe ọ gàrà ikpa nri, o debe isi n' akwa
Ọguta kwa ya, ọlọta be onye nwe ya bia dobe isi ya
Makana ebe ọbula ọ nọ, ihe ọ ga-eri agaghị akọ ya.

Ọzụzụ ụmụaka ekwesighi inwe akpa m òké
Makana nwata amụpụtara amụpụta bú nwa ọra
Otu onye siere ọha, ọha ga-ericha ma rachaa aka
Mànà ọha siere òtú onye, ukwu ga-efe ya azụ
Ikpara ụmụaka òké bú igbochiri mmírí ụzọ ya
Ijikọ aka zụọ ụmụaka bu naanị ụzọ kacha mma.

Thursday, November 19, 2020
Topic(s) of this poem: proverb
COMMENTS OF THE POEM
READ THIS POEM IN OTHER LANGUAGES
Close
Error Success