Ụwa Bú Ótụ Mbia Poem by Ifeanyi John Nwokeabia

Ụwa Bú Ótụ Mbia

Ụwa bú ótụ Mbia

Ekwe kụọ, ámá ágbá
Agughe ụzọ, agughe ọnu
Nwata akwọ n' azụ
Amaghị n' ije dị anya
Ụwa abụghị ebe obibi

Ahịa kà anyị niile bịara n'uwa
Mmadụ niile nọ n' ụwa bú ọbịa
Dika anyanwu sị amuke na ehihie
Ka anyị ga-esi wee chasia n'ụwa
Ma laghachi na urukpu igwe.


Ihe Onye ga-eme, ya saa anya ya
Makana ihe onye metara ka eji erota ya
Ézì aha kachasị ego mmá
Ya ka ejula ji eji nwayọọ a ga n'ọgụ
Tigbuo zọgbuo abụghị ihe ụwa chọrọ
Onye biri, ibe ya biri ka mma
Makana ụwa ga-abasi onye ọbula.

Ụwa bú ótụ Mbia na ndụ anyị niile
Anyị niile bu ndi ọbịa n' elu uwa a
Ụbọchị anyị ga-alaghachi, anyị amaghị
Ka anyị were nwaobere oge anyi nwere
Mepụta ihe gbara ọkpụrụkpụ n'elu ụwa a.

Thursday, November 19, 2020
Topic(s) of this poem: advice
COMMENTS OF THE POEM
READ THIS POEM IN OTHER LANGUAGES
Close
Error Success